Ndị na-achị ehi egbuola ihe karịrị ise na Plateau Steeti

Ebe foto si, AFP
Ihe dịka mmadụ asatọ nọ n'ụlọọgwụ anara ọgwụgwọ n'ihi ahụ ha merụrụ mgbe agbara ha egbe.
Onyeisi ndị otu ọganiru a na-akpọ IDA bụ Sunday Abdu kwuru na mwakpo a bidoro kemgbe abalị abụọ gara aga ma ruo ụnyahụ.
O kwukwara na ha bụ ndị ọrụ IDA ka na-agagharị na-agụonụ ndị merụrụ ahụ na ndị nwụrụ anwụ ka ha mara ndị ekwesiri inye aka.
Onye na-anọchite anya ndị uwe oji na Plateau steeti bụ Tyopev Matthias Terna ekwuola n'akụkọ nke a mere n'ezie.
Terna gwara ndị ntaakụkọ na ha bụ ndị uweojii nwetara oku gbataosoenyemaka na Jebbu Miango, ha we diri njikere gaa ebe ahụ.
Ọ si na ka ha na-eru ebe ahụ ndị ahụ ji egbe awakpọ obodo ha gbapụrụ ọsọ.
Ụlọ obibi ruru iri abụọ ka ndị ahụ gbara okụ.
Akụkọ nke a n'abịa mgbe onye ochịchị Plateau na-agọ agụgọ na okewapụla ọtụtụ ala ịnye ndị ọchị ehi ka ha biri.































