Festus Oshabah Ferotex: Gọvanọ Peter Mbah na dị ọzọ atụọla arịrị maka ọnwụ ọrụụzọ a n'ihe mberede okporoụzọ

Festus Oshabah
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Arịrị na anya mmiri ejula ọtụtụ ụmụafọ Nigeria ọkachasị ndị ọwụwa anyanwụ n'ihi ọnwụ otu nwoke a ma ama ma bụrụkwa onye nwe ụlọọrụ na-arụ okporoụzọ a kpọrọ Ferotex Constructions.

Ichie Festus Oshaba-Onuh nwụrụ n'ụbọchị Tọzde, abalị 19 nke ọnwa Novemba n'ihe mberede okporoụzọ mere n'okporoụzọ si Enugu gawa Port-Harcourt, dịka gọvanọ Enugu State bụ Peter Mbah si kwuo n'ozi o wepụtara n'akara ọbaozi ya na X a mabụ dịka Twitter n'ụtutụ Fraide.

Ozi ahụ sịrị, "Ọ bụ na nnukwu obi mwute ka m ji nweta ozi mgbawaobi maka ọnwụ nwanne anyị nwoke bụ Ichie Chief Festus Oshaba-Onuh n'ihe mberede okporoụzo n'okporoụzọ awara awara si Enugu gawa Port-Harcourt."

Gọvanọ Mbah gara n'ihu kọwaa Oshaba dịka, "onye na-emere ọha ọgọ, onye hụrụ ala nna ya n'anya nakwa onye nwere mmasị n'ọganihu nke Enugu State site na inye aka na mwulite ewumewu na-enyere ndụ aka na steeti anyị."

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

N'otu aka ahụ, Sinetọ na-anọchite Enugu-West bụ Osita Ugwu tụrụ arịrị sị, "Onye nwere obi inyere ndị obodo anyị aka efunarịla ndị Enugu".

Ọ gara n'ihu kpee ekpere ka Chukwu kasie ezinụlọ ya, ndị enyi na ndị obodo ndị Enugu Ezike obi n'oge ihe mgbu nke a.

Ihe ndị ị maghị maka Oshaba

Felix Oshaba

Felix Oshaba bụ onye obodo Umuagama dị n' Enugu-Ezike n'okpuru ọchịchị Igbo-Eze North n' Enugu State.

Ọ bụ onye ọrụ ebere ji ego ya enyere ọha ndị mmadụ aka site n'ụlọọrụ ebere ọ kpọrọ 'Ferotex Empowerment Foundation'.

Oshaba bụ onye hụrụ egwuregwu n'anya ma jirikwa ego ya akwado egweuregwu ma n'obodo ya nakwa na steeti ya gụnyere otu egwu ball 'Rangers Football Club'.

Ọ bụ onye nhazi ego nke otu achụmntavootu APC n'Enugu Steeti.