Alina Kabaeva: Onye bụ nwaanyị a echeere bụ enyi nwaanyị Vladmir Putin?

Ebe foto si, Reuters
Dịka mba dị icheiche na-ata ndị niile nọ Putin nso ahụhụ maka agha ọ na-alụ na mba Yukren, ndị mmadụ akpọọla oku ka ata Alina Kabaeva ahụhụ dịka echeere na ọ bụ enyi nwaanyị onyeisiala Rọshịa.
Mana Vladmir Putin agọọla mbụ na o nweghi ihe jikọrọ ya na Kabaeva.
N'afọ 2008, o nwere otu ụlọ ntaakụkọ biputara akụkọ na Putin na-akwado ịgba nwunye ochie ya alụkwaghị m ma lụọ Alina mana ha abụọ pụtara gọọ akụkọ ahụ.
Gọọmentị mba Rọshịa mechara gbachie ụlọntaakụkọ ahụ akpọrọ Moskovsky Korrespondent ebe Putin na nwunye ya sere okwu na 2013.
Onye bụ Alina Kabaeva
- Ọ bụ onye a ma ama n'egwuregwu akpọrọ "Rhythmic Gymnastics"
- N'okpuru ndu ya, Mba Rọshịa ritere ọlaedo niile n'egwuregwu ahụ site n'afọ 2000 rue 2016
- Ọ malitere egwuregwu a n'afọ 1996.
- Ọ lara ezumike nka n'egwuregwu ma banyezie ọrụ mgbasaozi nakwa ndọrọndọrọ ọchịchị.
- Ọ nwetere ọkwa n'ụlọomeiwu nta nke mba Rọshịa site n'afọ 2007 rue afọ 2014.
- Kemgbe afọ 2014, ọ bụ onyeisioche ụlọ ntaakụkọ 'National Media Group' ebe ọ na-erite nde paụnds iri na abụọ kwa ọnwa.
- Ndị mmadụ kpọrọ oku ka achụpụ ya n'ụlọ ya dị na mba Switzerland maka ebubo ịbụ enyi nwaanyị Putin nakwa ozi nkwado ọ na-agbasa maka Rọshịa.
Mmadụ 25 anwụọla n'ọkụ gbara n'ụlọ oriri na ndịna

Ihe ruru mmadụ iri abụọ na abụọ anwụọla ebe mmadụ ruru iri isii nọ n'ụlọ ọgwụ anata ọgwụgwụ ka ogbunigwe gbapụchara n'ụlọ oriri na ndịna kacha galaa ọnụ na mba Cuba.
A na-eche na ọ bụ ụgbọala bu gassị adọwara n'ihu ụlọ oriri na nkwarị Saratoga gbawara ma mụnye ọkụ mebiri ọtụtụ ogo dị n'ụlọ oriri ahụ.
Ụlọ oriri ahụ bụ nke diwara kamgbe ochie kwesiri imepe ụzọ ha ka ọrịa covid mechara ka ha mechie ya n'abalị anọ na-abịanụ.
Ugbua ọ bụzị ebe dakpọrọlanụ dịka ọtụtụ ahụ aja ya dara ada.
Ndị ọrụ gbata gbata ejula ebe ahụ ugbua ma na-achọ ịzọpụta ndị tọrọ atọ n'ime ụlọ ahụ ugbua.
Onyeisiala mba Cuba kwuru na ndị nwụrụ na ya bụ ọdachị ahụ gụnyere nwaanyị dị ime nakwa otu nwata ebe ndị merụrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ.

Ebe foto si, Getty Images
































