Agbapụtala mmadụ 955 ndị tọrọ n'ime ala na mba Saut-Afrịka

Ebe foto si, AFP/Getty Images
A gbapụtala mmadụ ruru narị itoolu na iri ise na ise ndị na-arụ ebe a na-egwuputa edo na Saut-Afrịka.
Ha tọburu n'ime ala ebe ọkụ latrik ha nyụrụ ụbọchị mbụ nke ọnwa Febụwarị.
Dịka James Wellsted bụ onye nkwuchiteọnụ ụlọọrụ ngwupụta ahụ bụ Sibanye-Stillwater siri kwuo,"Mmadụ niile apụtala."
O kwuru na e nwere "ndị akpịrị kpọrọ nkụ nakwa ndị nwere ọbara mgbali elu man ọbụghị ihe nwere isi".
Mba Saut-Afrịka so na mba ndị kachasị na-igwupụta edo mana nchekwa n'ọrụ ahụ bụ ebe nsogbu nọ.
Ọrụngwuputa na Saut-Afrịka na-ere isi abụọ
Ihe mberede ahụ mere oge egbeigwe gbara mebie ọkụ latrik ha.
Mana ọkụ laghachitara taa na ihe eji ebuli mmadụ a na-akpo "lift" na bekee nke nyere aka ibugota ndị ọrụ ahụ.
"Ọ siere anyị ike maka ikuku adịghị", bụ otu onye ọrụ ndị agbapụtara bụ Mike Khonto siri hụ ya.
"Anyi na-enye ekele maka ndị isi ụlọọrụ anyị nwenwuruike izitere anyị nri na mmiri."
Dịka agbapụtara ha, a na-eduga ha ka ha sa ahụ ma rie nri tupu ha aga nyocha n'ụlọọgwụ.

Ebe foto si, AFP/Getty Images
Ụmụnne ndị ahụ trọ gbakọọ n'ụzọ ụlọọrụ ha mana ndị nche jidere ha.
Wellsted kwuru na "onwebeghi ihe gosiri na o nwere onye nwere nsogbu mana ihe ahụ mere bụ ihe "igbawa obi"
Otu ndị ọrụ ekwubuola nd ha na-atụ ujọ na ndị ọrụngwụputa nọ n'ihe ize ndụ.
































